29ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.
30Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.
31Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.
32Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, na-achọ ịnapụ ha ndụ ha;
33ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe.