27Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.
28Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ;
29ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.
30Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.
31Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.