1Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe, maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ.
2Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ, aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ.
3Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.
4Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.