Abụ Ọma 4

Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? Sela

Psalm 4:2 (UKJV) O all of you sons of men, how long will all of you turn my glory into shame? how long will all of you love vanity, and seek after leasing? Selah.

1Zaa m mgbe m na-akpọku gị Chineke m, gị onye ezi omume; Napụta m site nʼihe mgbu m, meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.

2Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? Sela

3Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.

4Maanụ jijiji, unu emehiekwala; mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu; nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.