Abụ Ọma 48

Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya.

Psalm 48:1 (UKJV) Great is the LORD, and greatly to be praised in the city of our God, in the mountain of his holiness.

1Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya.

2Ọ mara mma nʼịdị elu ya, bụkwa ọṅụ elu ụwa niile. Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu, dịka ebe kachasị elu nke Zafọn.

3Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike; o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.