8Dịka anyị nụrụ, otu a ka anyị hụrụ, nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nʼime obodo Chineke anyị: Chineke na-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Sela
9O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị, ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ.
10O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume.
11Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ, obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ nʼihi ikpe gị niile.
12Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu, gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ.