10O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume.
11Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ, obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ nʼihi ikpe gị niile.
12Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu, gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ.
13Lezienụ mgbidi ya niile anya, nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike, ka unu nwee ike ịkọrọ ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a.
14Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi, ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.