6Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi; Onyenwe anyị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile na ndị aghụghọ niile asị.
7Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị, site nʼoke ịhụnanya gị; aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị.
8Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị nʼihi ndị iro m; mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
9Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi, a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe; ha ji ire ha ekwu okwu ụgha.
10Maa ha ikpe, Chineke. Mee ka nzube ọjọọ ha niile bụrụ ọdịda ha. Chụpụ ha nʼihi ịba ụba nke ọtụtụ mmehie ha, nʼihi na ha enupula isi megide gị.