5Ndị mpako agaghị eguzo nʼihu gị. Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.
6Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi; Onyenwe anyị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile na ndị aghụghọ niile asị.
7Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị, site nʼoke ịhụnanya gị; aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị.
8Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị nʼihi ndị iro m; mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
9Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi, a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe; ha ji ire ha ekwu okwu ụgha.