13Ana m ata anụ oke ehi, ka ọ bụ ọbara mkpi ka m ga-aṅụ?
14“Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu,
15ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị, aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.”
16Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu?
17Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu.