30Baara anụ ọhịa ahụ zoro nʼetiti riidi mba, igwe oke ehi nọ nʼetiti ụmụ ehi nke mba niile. Site na nweda nʼala, ka o wetara gị ogbe ọlaọcha. Chụsasịa mba niile, bụ ndị na-enwe mmasị nʼibu agha.
31Ndị nnọchi anya obodo, ga-esite nʼIjipt bịa, Kush ga-etinye onwe ya nʼokpuru Chineke.
32Bụkuo Chineke abụ, unu alaeze niile nke ụwa, bụkuo Onyenwe anyị abụ otuto, Sela
33Bụọ abụ nye onye na-agba ịnyịnya nʼeluigwe, e, ọ bụladị eluigwe nke dịrị site na mgbe ochie, onye olu ike ya dịka egbe eluigwe.
34Kwusaa ike Chineke, onye ịdị ukwuu nke ịma mma ya na-ekpuchi Izrel, onye ike ya dị nʼeluigwe.