Abụ Ọma 68

Bụọ abụ nye onye na-agba ịnyịnya nʼeluigwe, e, ọ bụladị eluigwe nke dịrị site na mgbe ochie, onye olu ike ya dịka egbe eluigwe.

Psalm 68:33 (UKJV) To him that rides upon the heavens of heavens, which were of old; lo, he does send out his voice, and that a mighty voice.

31Ndị nnọchi anya obodo, ga-esite nʼIjipt bịa, Kush ga-etinye onwe ya nʼokpuru Chineke.

32Bụkuo Chineke abụ, unu alaeze niile nke ụwa, bụkuo Onyenwe anyị abụ otuto, Sela

33Bụọ abụ nye onye na-agba ịnyịnya nʼeluigwe, e, ọ bụladị eluigwe nke dịrị site na mgbe ochie, onye olu ike ya dịka egbe eluigwe.

34Kwusaa ike Chineke, onye ịdị ukwuu nke ịma mma ya na-ekpuchi Izrel, onye ike ya dị nʼeluigwe.

35O Chineke, ị dị oke egwu nʼime ụlọnsọ gị; Chineke nke Izrel na-enye ndị ya ume na ike. Toonu Chineke!

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.