11Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.
12Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị, ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ, ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.
13Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ; ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ.
14Onye ọbụla dị ime ajọ ihe, na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta.
15Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba nʼime olulu ahụ o gwuru.