9O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.
10Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.
11Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.
12Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị, ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ, ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.
13Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ; ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ.