10Ndị eze Tashish na mba niile dị nʼebe dị anya, ga-atụ ụtụ wetara ya; e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba, ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye.
11Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya, mba niile ga-ejekwara ya ozi.
12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.
13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.
14Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike, nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.