12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.
13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.
14Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike, nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.
15Ka ọ dị ogologo ndụ! Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba. Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile, ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.
16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a; ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile. Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn; ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.