1O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị.
2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.
3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba; ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.
4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ, zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa; ọ ga-egwepịa onye mmegbu.