2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.
3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba; ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.
4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ, zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa; ọ ga-egwepịa onye mmegbu.
5Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide, dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.
6Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ, dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.