1A maara Chineke nʼobodo Juda; aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.
2Ụlọ ikwu ya dị na Salem, ebe obibi ya dị na Zayọn
3Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma, na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela
4Ị jupụtara nʼìhè, ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.