29Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ, nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ.
30Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ, anụ ụfọdụ dịkwa ha nʼọnụ,
31mgbe iwe Chineke biliri imegide ha; o tigburu ndị kachasị ike nʼetiti ha, tigbukwaa ụmụ okorobịa ndị Izrel.
32Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha, jụkwa ikwere nʼọrụ ebube niile Onyenwe anyị rụrụ.
33O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu. O mekwara ka afọ ha gwụsịa nʼobi ọlụlọ mmiri.