52Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ; o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara.
53O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha, ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha.
54Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya, ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara.
55Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.
56Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya.