51O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham.
52Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ; o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara.
53O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha, ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha.
54Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya, ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara.
55Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.