49O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha, oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya, ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ.
50O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso; o gbochighị ka ha ghara ịnwụ; kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe.
51O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham.
52Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ; o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara.
53O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha, ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha.