64E gburu ndị nchụaja ha nʼagha; ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ.
65Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta, dịka dike si nʼụra mmanya teta.
66Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ, mee ha ihe ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi.
67Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef, ọ họpụtaghị ebo Ifrem;
68ma ọ họọrọ ebo Juda, na ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ nʼanya.