5O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha,
6ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
7Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha, ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche. Ha ga-edebekwa iwu ya niile.
8Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha, ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike; ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ, ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya.
9Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha, chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha.