3ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.
4Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
5O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha,
6ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
7Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha, ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche. Ha ga-edebekwa iwu ya niile.