1Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi; geenụ ntị nʼokwu ọnụ m.
2Aga m eji ilu malite okwu m, aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie;
3ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.
4Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
5O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha,