2nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase. Kpọtee ịdị ike gị, bịa zọpụta anyị.
3O Chineke, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
4O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ megide ekpere ndị gị?
5I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri; i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ.
6I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị, ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị.