1Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel, gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ. Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim, nwupụta Ìhè
2nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase. Kpọtee ịdị ike gị, bịa zọpụta anyị.
3O Chineke, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
4O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ megide ekpere ndị gị?