8Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha, ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. Sela
9Mee ha dịka i si mee ndị Midia, na dịka i mere Sisera na Jabin, nʼakụkụ iyi Kishọn,
10ndị lara nʼiyi nʼEndoa ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala.
11Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb, ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna,
12ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.”