9Mee ha dịka i si mee ndị Midia, na dịka i mere Sisera na Jabin, nʼakụkụ iyi Kishọn,
10ndị lara nʼiyi nʼEndoa ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala.
11Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb, ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna,
12ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.”
13O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu, maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị.