Abụ Ọma 89

Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,

Psalm 89:3 (UKJV) I have made a covenant with my chosen, I have sworn unto David my servant,

1Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị.

2Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe.

3Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,

4‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela

5O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.