1Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị.
2Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe.
3Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,
4‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela