Abụ Ọma 89

O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.

Psalm 89:5 (UKJV) And the heavens shall praise your wonders, O LORD: your faithfulness also in the congregation of the saints.

3Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,

4‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela

5O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.

6Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị? Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile?

7Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.