Abụ Ọma 9

Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe; jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.

Psalm 9:8 (UKJV) And he shall judge the world in righteousness, he shall minister judgment to the people in uprightness.

6Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m, I hopukwala obodo ha niile. Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.

7Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.

8Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe; jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.

9Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu. Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.

10Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.