5I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi, hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.
6Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m, I hopukwala obodo ha niile. Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.
7Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.
8Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe; jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.
9Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu. Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.