Abụ Ọma 90

O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị? Meere ndị ohu gị ebere.

Psalm 90:13 (UKJV) Return, O LORD, how long? and let it repent you concerning your servants.

11Onye pụrụ ịghọta ịdị ike nke oke iwe gị? Nʼihi na oke iwe gị dị ukwuu dịka ịtụ egwu kwesiri gị si dị ukwuu.

12Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.

13O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị? Meere ndị ohu gị ebere.

14Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ, ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile.

15Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ, ka ọnụọgụgụ afọ ya dịkwa ka ọnụọgụgụ afọ niile anyị hụrụla nsogbu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.