12Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.
13O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị? Meere ndị ohu gị ebere.
14Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ, ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile.
15Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ, ka ọnụọgụgụ afọ ya dịkwa ka ọnụọgụgụ afọ niile anyị hụrụla nsogbu.
16Kwere ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị dị iche iche, ka ụmụ ha hụkwa ịma mma gị.