1O Onyenwe anyị, ebe obibi ka gị onwe gị bụrịị nye anyị nʼọgbọ niile.
2Tupu e kee ugwu niile, na tupu a kpụọ ụwa na elu ụwa, siterị na mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi, ị bụ Chineke.
3Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja mgbe i kwuru okwu sị, “Unu ụmụ mmadụ, laghachi bụrụ aja.”
4Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị; ha dịka ụnyaahụ gafere agafe maọbụ ka otu awa nke anyasị.