3Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
4Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
5Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
6Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.
7Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.