2Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
3Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
4Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
5Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
6Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.