5Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
6Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.
7Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
8Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya; werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.
9Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya; maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.