Abụ Ọma 96

Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya; werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.

Psalm 96:8 (UKJV) Give unto the LORD the glory due unto his name: bring an offering, and come into his courts.

6Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.

7Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.

8Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya; werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.

9Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya; maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.

10Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.