2Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.”
3O duuru m nʼime mmụọ baa nʼọzara. Nʼebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nʼelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Aha ndị e dere anụ ọhịa ahụ nʼahụ bụ naanị okwu ikwulu Chineke.
4Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya.
5Aha e dekwasịrị ya nʼegedege ihu bụ ihe omimi: Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn, nne ndị na-akwa iko na nke ihe arụ niile nke ụwa.
6Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị ama Jisọs. Mgbe m hụrụ ya, ọ gbagwojuru m anya.