Mkpughe 17

Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị ama Jisọs. Mgbe m hụrụ ya, ọ gbagwojuru m anya.

Revelation 17:6 (UKJV) And I saw the woman drunken with the blood of the saints, and with the blood of the martyrs of Jesus: and when I saw her, I wondered with great admiration.

4Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya.

5Aha e dekwasịrị ya nʼegedege ihu bụ ihe omimi: Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn, nne ndị na-akwa iko na nke ihe arụ niile nke ụwa.

6Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị ama Jisọs. Mgbe m hụrụ ya, ọ gbagwojuru m anya.

7Ma mmụọ ozi ahụ sịrị m, “Gịnị mere ihe ị hụrụ ji ju gị anya? Aga m akọwara gị ihe omimi banyere nwanyị a na anụ ọhịa ahụ nke na-ebugharị ya, bụ nke nwere isi asaa na mpi iri.

8Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.