5Onye ọbụla na-emeri emeri, ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dịka ha. Agaghị m ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, kama aga m ekwupụtakwa aha ahụ nʼihu Nna m na nʼihu ndị mmụọ ozi niile.
6Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ nsọ na-agwa nzukọ niile.
7“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Filadelfia, sị ya: Ndị a bụ okwu onye dị nsọ na onye eziokwu, onye ahụ ji ọtụghe igodo Devid, nke o ji emeghepụ ihe onye ọbụla na-apụghị imechi, na nke o ji emechi ihe onye ọbụla na-apụghị imeghe.
8Amaara m ọrụ gị niile. Lee, edebela m nʼihu gị ọnụ ụzọ nke e meghere emeghe, nke onye ọbụla na-apụghị imechi. Amaara m na i nwere ike dị ntakịrị, ma i debere okwu m, ị gọnarịkwaghị aha m.
9Aga m eme ka ndị ahụ so na nzukọ ekwensu, bụ ndị na-asị na ha bụ ndị Juu ma ha abụghị, kama ha bụ ndị ụgha, aga m eme ka ha bịa kpọọ isiala nye gị, si otu a ghọta na ahụrụ m gị nʼanya.