5Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya, unu ụmụ agbọghọ Jerusalem. Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
6Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji. Ọ bụ anwụ gbajiri m. Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m, zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị, ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.
7Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya, ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri? Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie? Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.
8Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma, soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.
9Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.