Abụ nke Abụ 4

Eze gị dị ka igwe atụrụ a ka kpachapụrụ ajị ha ọhụrụ, nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke gba aka nwa nʼetiti ha.

Song of Solomon 4:2 (UKJV) Your teeth are like a flock of sheep that are even shorn, which came up from the washing; whereof every one bear twins, and none is barren among them.

1Leenụ ka i si maa mma, onye m hụrụ nʼanya, e, ị mara mma! Anya gị abụọ nke dị nʼazụ akwa mkpuchi ihu gị dị ka nduru. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịda nʼakụkụ ugwu Gilead.

2Eze gị dị ka igwe atụrụ a ka kpachapụrụ ajị ha ọhụrụ, nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke gba aka nwa nʼetiti ha.

3Egbugbere ọnụ gị abụọ dị ka ogho uhie. Ọnụ gị dị mma ile anya. Agba nti gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ.

4Olu gị dị ka ụlọ elu Devid, nke e wuziri nke ọma. E konyere puku ọta na ya, ha niile bụ ọta nke ndị ọka nʼagha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.