5Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ, nke otu nne mụrụ nʼotu oge, ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi.
6Tutu chi ụtụtụ abọọ, tutu onyinyo agbalaga, aga m aga nʼugwu ụda máá na nʼugwu insensi.
7Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya, ọ dịkwaghị ntụpọ ọbụla dị gị nʼahụ.
8Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ. Si na Lebanọn bịa soro m; rịdata site nʼugwu Amana, nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon, site nʼọgba ọdụm nʼugwu niile ebe agụ bi.
9I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m; i riela m obi, i werela ile anya gị na ihe olu i yi rie obi m.