Abụ nke Abụ 4

Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ, nke otu nne mụrụ nʼotu oge, ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi.

Song of Solomon 4:5 (UKJV) Your two breasts are like two young roes that are twins, which feed among the lilies.

3Egbugbere ọnụ gị abụọ dị ka ogho uhie. Ọnụ gị dị mma ile anya. Agba nti gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ.

4Olu gị dị ka ụlọ elu Devid, nke e wuziri nke ọma. E konyere puku ọta na ya, ha niile bụ ọta nke ndị ọka nʼagha.

5Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ, nke otu nne mụrụ nʼotu oge, ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi.

6Tutu chi ụtụtụ abọọ, tutu onyinyo agbalaga, aga m aga nʼugwu ụda máá na nʼugwu insensi.

7Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya, ọ dịkwaghị ntụpọ ọbụla dị gị nʼahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.